Olu Ndigbo Di N’Iche N’Iche

Onitsha, Enuanị, Nsukka, Owerri na olundị ndị ọzọ dị n’Igbo na njirimara ha

Ụmụnwaanyị Delta

igbo na-asụ n’olu, nolu mana a kwaa ụkwara, ọ bụrụ otu. E nwere ọtụtụ olundị dị iche iche mana asụsụ Igbo bụ otu.

N’ezie, obodo ọbụla n’Igbo nwere olu nke ha na-asụ mana ndị ọkammụta mere nnyocha olundị a niile ma chịkọta ha were kwuo na asụsụ Igbo nwere olundị karịrị otu narị.

Ịgba ndụ, Orịkọ na ụzọ ndị ọzọ Igbo ji ekpezi esemokwu oge gboo

Igbo History: Ọgụ Biafra abụghị mbụ Igbo na-egosi ‘ofu obi,’ Ị ma maka ‘Igbo Landing’?

Lee ndị Igbo nwere olileanya na Israel ga-anabata ha dịka ndị Jew

Ụfọdụ n’ime ha gụnyere; Ịka, Enuanị, Nsụka, Izzi, Ezaa, Ikwere, Ọhụhụ, Owerre, Ọnịcha wdg.

Igbo Izugbe

Ọtụtụ mgbe, ụfọdụ ndị Igbo na-adọrịta ụka banyere mpaghara Igbo nwe Igbo Izugbe nke a na-akpọ ‘Standard Igbo’ na bekee.

Ọ bụ ụdị asụsụ Igbo nke a ka e ji ede ihe ma bụrụkwa nke e ji akụzi ma na-ele Waec.

Ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ Owere, ụfọdụ asị na ọ bụ Igbo Ọnicha, mana nke bụ eziokwu bụ na ọ bụ olundị di iche iche ka a chịkọbara ọnụ iji mebe ya bụ Igbo Izugbe.

Uru 12 ọmụ baara ndị Igbo

Ndị Igbo sị na ha abụghị Igbo na ihe kpatara ya

Dịka Ọkammụta Chigozie Nnabuihe, onye nkuzi Igbo na mahadum ‘University of Lagos’ siri kwuo, “o nweghị ndị (Igbo) enweghị okwu ha n’Igbo Izugbe”.

Ọ bụ n’ihi oke ndịiche dị n’olundị mere ka ndị ọkachamara Igbo n’aha otu ‘Society for Promoting Igbo Language and Culture (SPILC)’ jiri jikọta were hazie Igbo Izugbe n’afọ 1971/72.

Ha chịkọtara Igbo nke ndị ụka CMS bụ ‘Union Igbo’, ‘central dialect’ nke Ụka Katọlik, ‘Isuama Igbo’ nakwa okwu mbite ndị adịbughị n’okwu Igbo.

Tupu nke a, ndị ụka CMS na ndị Ụka Katọlik bụ ndị nwere olu Igbo nke ha ji ede akwụkwọ ha n’asụsụ Igbo na-eme ndị kwe na ndị ekweghị, dịka ha na gọọmentị dọrịtara ọtụtụ afọ gboo nke e ji mee ‘standard Igbo.”

Kedụ ihe mere asụsụ Igbo ji dị iche iche?

Ndị ọkammụta Igbo nwere ụzọ dị iche iche ha sị akọwa ihe kpatara ndịiche n’asụsụ Igbo.

Ụfọdụ na-ekwu na ihe nwere ike ibute ndịiche n’olu asụsụ Igbo gụnyere; agbataobi onye, njem na azụmahịa, na ihe ndị ọzọ.

Onye ya na ibe ya bụ agbataobi ga-enwe otu olu.

Ọbụladị ma ha nwee olu ndị dị iche iche, onye ya na ibe ya na-emerịta njem maọbụ na-azụkọ ahịa ga-asụ Igbo n’ụdị ibe ya ga-eji aghọta ya.

O kwukwara na Igbo si mpaghara Alaigbo ọzọ nọkọọ, ha na-ahazị olundi nke ha ka ọ dịtụ ka Igbo ndị Ọnịcha.

Nke a bụ maka na e ji nnukwu anya ele ndị Ọnịcha n’ihi na ha so na ndị ha na ndị ọcha bu ụzọ mekọọ ihe dịka azụmahịa, agụmakwụkwọ nakwa mgbasa oziọma.

Ikuku, Osimiri, Ugwu na Ndagwurugwu

Na nkọwa ya, Ọkammụta Nnabuihe, sị na ọ bụ mmiri, ikuku, ugwu na oke ọhịa na-eweta adịmniche n’ihe mmadu na ibe ya na-asụ.

Nnabuihe sịrị, “ikuku nwere ike ikusasi ụda okwu si n’ọnụ okwu na-abanye na ntị mmadụ nke nwere ike ibute nnụhie.”

“Nnụhie nwekwazịrị ike ibute mkpọhie.”

“Ọ bụrụ na mmadụ abụọ na-akpa nkata nọrọ onwe ha nso, nnụhie ga-ara ahụ ịbata.”

“Ya mere na ndị bi n’otu mpaghara ebe ha na-anụ onwe ha ọfụma ọfụma na-enwe otu olu.”

“Mana ngwa ngwa e nwere ndị si mpaghara ọzọ, ebe dị anya na-anụ, ụda okwu ahụ si n’ọnụ mmadụ nwere ikuku dị ike na-ekusasị ya. ”

“Ya kpatara, e nwee nnụhie, onye na-ekwu ekwu ga-agba mbọ ịhụ na onye na-anụ anụ nụtara ọfụma.”

“Onye na-anụ anụ ga-agba mbọ ka ọ nụta ihe a gwara ya ọfụma. Nnụhie na-akpata mkpọhie.”

Ya mere ụfọdụ ji akpọ “aha”, ụfọdụ akpọ ya “afa”. Maọbụ ụfọdụ akpọọ “ihe”, ndị ọzọ akpọọ “ife”.

Ndagwurugwu: Nnabuihe sịrị na ọ bụrụ na okwu okwu nọ n’ugwu, ọnụ okwu nọrọ na ndagwurugwu, o nweghị ka okwu okwu ga-esi kwuo okwu, ọnụ okwu anụ ya kpọmkwem, “a ga-enwenata mgbanwe”.

Osimiri: N’okwu etu osimiri si emetụta ndịiche n’olundị, Nnabuihe sị, “Osimiri, nwere ebe ọ na-ekwo ekwo, nwee ebe ọ na-aga nwayọọ. Etu o si nwee mgbanwe ka e si enwe mgbanwe n’olu ndị na-aṅụ ya.”

“Ya mere onye gaa mba ọzọ nọọ ọnwa ole na ole sụwa asụsụ ndị ahụ, a sị na ‘ọ ṅụọla mmiri ha’.”

Onye nọ n’ofe mmiri nke a na onye nọ n’ofe mmiri nke ọzọ, na-enwe adịmiche.”

Oke ọhịa: Ọ kọwara na ụzụ ahịhịa dị n’ọhịa na-eme ma ikuku buo ya na-emetụta olundị.

“O nyere nsogbu ka onye nọ n’akụkọ ọhịa nke a na onye nọ n’akụkụ ọhịa nke ọzọ ghọta onwe ha ọfụma.”

Ugwu: Nnabụihe kọwara na ugwu nwere ike ịnọchi mmadụ abụọ na-ekwu okwu, “ọ bụrụ na ọ dịrị karịa, o nwere ike ịghọ asụsụ ọzọ”.

Kedụ ebe ha si akpọpụta okwu ụfọdụ?

Nnabuihe kọwara na adịmiche a na-enwe na ndị na-asụ otu asụsụ nwere ike bụrụ nke metụtara mpaghara okwu maọbụ okwu.

Ihe ndị Bekee kpọrọ ‘plosives’, ‘fricatives’ na ‘affricates’.

Iji maa atụ:

1. Agbọghọ (girl) = okporo (Onịcha)= mgbọtọ (Owere)= Okposho (Ịka) =okpoho (Enuanị).

2. A nabatara akị na akụ n’Igbo Izugbe mana olundị dị iche nwere ihe ha na-akpọ ya: Akụ (palm kernel) = mkpịrị (Owere) = mkpọkịrị (Mbieri) = agba (Mbaitoolu)

3. Ikwe (mortar) = oshibo (Owere)= otiwe (Mbaise), etiri (Ọlụ) = Onicha

4. Ngaji (spoon) = Ngazị (Ọnịcha) nkọm (Ọhafia)

Lee ndịiche dị n’olu ndị ụfọdụ:

Olundị e nwere dị gụnyere Waawa, Enuani, Ngwa, Ohuhu, Etche, Olu, Ika, Anioma, Ukwuani, Ikwerre, Ezaa, Izzi, Ekpeye, Ohafia, Abam wdg.

Ma lee ndị iche dị n’ụfọdụ olundị ahụ:

Nsụka/sh/ = Owere /h/= Onicha/r/ = Enuani/sh/= Ika/h/Mgbochiume /h/ dị n’ahụ (body) bụ /sh/ na Nsụka (eshụ); /r/ n’Ọnịcha(arụ), /sh/ n’Enuani (ashụ), /h/ n’Ịka (ehụ), /h/ n’Owere(ahụ).Ya bụ ndị Nsụka na-akpọ ahụ (body) ‘eshụ,’; ndị Ọnịcha na-akpọ ya ‘arụ’; Owere na-akpọ ya ‘ahụ’; ebe ndị Enuani na-akpọ ya ‘ashụ’.

Nsụka /gh/= Owere/ gh/= Onicha /w/=Enuanị /w/= Ịka /h/Ọmụma atụ: Ndị Nsụka na- akpọ ewu (goat) ‘eghu’, Owere na-akpọ ya ‘eghu’, Ọnịcha na-akpọ ya ‘ewu,’ ebe ndị Enuani na-akpọkwa ya ‘ewu’.

Nsụka /h/= Owere h/= Onicha /f/= Enuani/f/=Ika/h/Ọmụma atụ: Nsụka na-akpọ /ahụ/ (that), ‘ahụ’, Owere na-akpọ ya ‘ahụ’, Onịcha na-akpọ ya ‘afụ’, Enuanị na-akpọ ya ‘afụ’, ebe Ịka na-akpọ ya ‘ahụ’.

Olu Ọnịcha

Olu Ọnicha bụ olundị ndị Ọnicha na ndị agbata obi ha na-asụ.

Site ọnicha rue Asaba,Obosi na Onicha mana ụfọdụ ndị ji ekworo ga-agbagha na Ọnicha na ụfọdụ bi ha nso nwere otu olundị.

Olu Ọnịcha na-atọ ụtọ na ntị ma bụrụkwa ihe na-amasị ndị Igbo ndị ọzọ ilere anya n’ihi na ndị Ọnịcha so na ndị bu ụzọ zute ndị ọcha ma gụkwaa akwụkwọ Bekee.

Dịka Ọkammuụta Nnabuihe siri kọwaa njirimara olu Ọnịcha bụ “Olu ndị Onicha enweghị mkpọnume (aspiration), o nweghị mkpọnimi (nasalisation).”

Ọmụmaatụ: N’Olu Ọnịcha, ‘L’ bụ ‘n’:

Ala ( Igbo Izugbe) ( to go/earth)Ana (Ọnịcha)

Ara (Igbo Izugbe) (madnesss)Ala (Ọnịcha)

Ọmụma atụ ọzọ : ‘H’ bụ ‘f’ n’olu Ọnịcha.Ha (Igbo Izugbe) – they/them.Fa (Ọnịcha)

Ndị Enuanị

Enuanị pụtara ‘elu ala’ ya bụ ndị bi n’elu ugwu. Enuani bụ asụsụ ndị Igbo bi n’ Ọdịda Anyanwụ ikpere mmiri Naija.

Ndị na-asụ olu Enuani nọ na Delta Steeti, Obosi na Ogbaru dị n’Anambara Steeti, Ndoni na Rivas.

Ndị Mgbidi n’Imo steeti na ndị Ndoni na Rivas steeti na-asụkwa ya.

Nsụka

Olu Nsụka bụ olu ndị Nsụka na Enugwu steeti na gburgburu ha na-asụ.

Njirimara ha bụ na ha na-eji ‘ụ’ emem nyiri ụdaume ‘m’ maọbụ ‘n’.

Iji maa atụ: Ụma (knife or cutlass)

Mma (Igbo Izugbe)

Ha na-akpọkwa ‘w’ ‘gh’.

Iji maa atụ: “ewu’ bụ eghu n’olu Nsụka.

Olu Arọchukwu

Olu Arọchukwu bụ olu ndị Igbo ndị Aro dị n’Abịa steeti na-agbata obi ha na-azụ,

Ndị Arọ kesakwara na mpaghara dị iche iche na Abịa, Anambra, Ebonyi, Krọs Riva na Imo steeti.

Ndị Ọhafịa, Arondizuọgụ, Abam, Abiriba, Afikpo, Eko

Ha bụ obodo nwere mmasị n’omenala, azụmahịa na ije mba.

Njirimara ụfọdụ dị n’Asụsụ ha gụnyere:

Etu a (like this)( Igbo Izugbe)

Agaa( Arọ)

Waawa

Waawa bụ olu ndị Udi, Ezeagụ na Ngwo dị n’Enwgu steeti.

Otu njirimara ha bụ V bụ B

Ọmụma atụ: ụvụrụ (brain)ụbụrụ (Igbo izugbe)

Ha bụ ndị ụtọ Ndaa (How?) bụ ndee?

“Ị dụ ọyị” (How are you)Kedụ ka i mere? ( Igbo Izugbe)

2. Mii (water)Mmiri (Igbo izugbe)

Ikwere

Ikwere bụ olu ndị Igbo nọ n’ Elele, Isiokpo, Rumuji, Ernohua, Akpor, Aluu Igwuruta dị na Rivas steeti.

Ndị ọkammụta Igbo ụfọdụ na-ekwu na ndị Ikwere si Arochukwu,Ohaji, na Egbema gawa ebe ha bi taa.

Ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ Ọlụ nakwa Ọka ka ụfọdụ n’ime ha si.

Mana ụfọdụ ndị Ikwere n’onwe ha ekweghị na ha bụ ndị Igbo n’ihi okwu metụtara ndọrọndọrọ ọchịchị.

Njirimara olundị Ikwere: 1. ‘L’ bụ ‘N’;

Olu (Igbo Izugbe) – Voice, languageOnu (Ikwere)

2. Ọmụma atụ ọzọ

“S’ bụ ‘Sh’

Isi (To cook)Ishi (Ikwere)

Utụtụ (Morning)Ụkụtụ (Ikwere)

Owere

Scroll to Top