Olu Ndigbo Di N’Iche N’Iche
Olu Ndigbo Di N’Iche N’Iche Onitsha, Enuanị, Nsukka, Owerri na olundị ndị ọzọ dị n’Igbo na njirimara ha Ụmụnwaanyị Delta igbo na-asụ n’olu, nolu mana a kwaa ụkwara, ọ bụrụ otu. E nwere ọtụtụ olundị dị iche iche mana asụsụ Igbo bụ otu. N’ezie, obodo ọbụla n’Igbo nwere olu nke ha na-asụ mana ndị ọkammụta mere nnyocha olundị a niile ma chịkọta ha were kwuo na asụsụ Igbo nwere olundị karịrị otu narị. Ịgba ndụ, Orịkọ na ụzọ ndị ọzọ Igbo ji ekpezi esemokwu oge gboo Igbo History: Ọgụ Biafra abụghị mbụ Igbo na-egosi ‘ofu obi,’ Ị ma maka ‘Igbo Landing’? Lee ndị Igbo nwere olileanya na Israel ga-anabata ha dịka ndị Jew Ụfọdụ n’ime ha gụnyere; Ịka, Enuanị, Nsụka, Izzi, Ezaa, Ikwere, Ọhụhụ, Owerre, Ọnịcha wdg. Igbo Izugbe Ọtụtụ mgbe, ụfọdụ ndị Igbo na-adọrịta ụka banyere mpaghara Igbo nwe Igbo Izugbe nke a na-akpọ ‘Standard Igbo’ na bekee. Ọ bụ ụdị asụsụ Igbo nke a ka e ji ede ihe ma bụrụkwa nke e ji akụzi ma na-ele Waec. Ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ Owere, ụfọdụ asị na ọ bụ Igbo Ọnicha, mana nke bụ eziokwu bụ na ọ bụ olundị di iche iche ka a chịkọbara ọnụ iji mebe ya bụ Igbo Izugbe. Uru 12 ọmụ baara ndị Igbo Ndị Igbo sị na ha abụghị Igbo na ihe kpatara ya Dịka Ọkammụta Chigozie Nnabuihe, onye nkuzi Igbo na mahadum ‘University of Lagos’ siri kwuo, “o nweghị ndị (Igbo) enweghị okwu ha n’Igbo Izugbe”. Ọ bụ n’ihi oke ndịiche dị n’olundị mere ka ndị ọkachamara Igbo n’aha otu ‘Society for Promoting Igbo Language and Culture (SPILC)’ jiri jikọta were hazie Igbo Izugbe n’afọ 1971/72. Ha chịkọtara Igbo nke ndị ụka CMS bụ ‘Union Igbo’, ‘central dialect’ nke Ụka Katọlik, ‘Isuama Igbo’ nakwa okwu mbite ndị adịbughị n’okwu Igbo. Tupu nke a, ndị ụka CMS na ndị Ụka Katọlik bụ ndị nwere olu Igbo nke ha ji ede akwụkwọ ha n’asụsụ Igbo na-eme ndị kwe na ndị ekweghị, dịka ha na gọọmentị dọrịtara ọtụtụ afọ gboo nke e ji mee ‘standard Igbo.” Kedụ ihe mere asụsụ Igbo ji dị iche iche? Ndị ọkammụta Igbo nwere ụzọ dị iche iche ha sị akọwa ihe kpatara ndịiche n’asụsụ Igbo. Ụfọdụ na-ekwu na ihe nwere ike ibute ndịiche n’olu asụsụ Igbo gụnyere; agbataobi onye, njem na azụmahịa, na ihe ndị ọzọ. Onye ya na ibe ya bụ agbataobi ga-enwe otu olu. Ọbụladị ma ha nwee olu ndị dị iche iche, onye ya na ibe ya na-emerịta njem maọbụ na-azụkọ ahịa ga-asụ Igbo n’ụdị ibe ya ga-eji aghọta ya. O kwukwara na Igbo si mpaghara Alaigbo ọzọ nọkọọ, ha na-ahazị olundi nke ha ka ọ dịtụ ka Igbo ndị Ọnịcha. Nke a bụ maka na e ji nnukwu anya ele ndị Ọnịcha n’ihi na ha so na ndị ha na ndị ọcha bu ụzọ mekọọ ihe dịka azụmahịa, agụmakwụkwọ nakwa mgbasa oziọma. Ikuku, Osimiri, Ugwu na Ndagwurugwu Na nkọwa ya, Ọkammụta Nnabuihe, sị na ọ bụ mmiri, ikuku, ugwu na oke ọhịa na-eweta adịmniche n’ihe mmadu na ibe ya na-asụ. Nnabuihe sịrị, “ikuku nwere ike ikusasi ụda okwu si n’ọnụ okwu na-abanye na ntị mmadụ nke nwere ike ibute nnụhie.” “Nnụhie nwekwazịrị ike ibute mkpọhie.” “Ọ bụrụ na mmadụ abụọ na-akpa nkata nọrọ onwe ha nso, nnụhie ga-ara ahụ ịbata.” “Ya mere na ndị bi n’otu mpaghara ebe ha na-anụ onwe ha ọfụma ọfụma na-enwe otu olu.” “Mana ngwa ngwa e nwere ndị si mpaghara ọzọ, ebe dị anya na-anụ, ụda okwu ahụ si n’ọnụ mmadụ nwere ikuku dị ike na-ekusasị ya. ” “Ya kpatara, e nwee nnụhie, onye na-ekwu ekwu ga-agba mbọ ịhụ na onye na-anụ anụ nụtara ọfụma.” “Onye na-anụ anụ ga-agba mbọ ka ọ nụta ihe a gwara ya ọfụma. Nnụhie na-akpata mkpọhie.” Ya mere ụfọdụ ji akpọ “aha”, ụfọdụ akpọ ya “afa”. Maọbụ ụfọdụ akpọọ “ihe”, ndị ọzọ akpọọ “ife”. Ndagwurugwu: Nnabuihe sịrị na ọ bụrụ na okwu okwu nọ n’ugwu, ọnụ okwu nọrọ na ndagwurugwu, o nweghị ka okwu okwu ga-esi kwuo okwu, ọnụ okwu anụ ya kpọmkwem, “a ga-enwenata mgbanwe”. Osimiri: N’okwu etu osimiri si emetụta ndịiche n’olundị, Nnabuihe sị, “Osimiri, nwere ebe ọ na-ekwo ekwo, nwee ebe ọ na-aga nwayọọ. Etu o si nwee mgbanwe ka e si enwe mgbanwe n’olu ndị na-aṅụ ya.” “Ya mere onye gaa mba ọzọ nọọ ọnwa ole na ole sụwa asụsụ ndị ahụ, a sị na ‘ọ ṅụọla mmiri ha’.” Onye nọ n’ofe mmiri nke a na onye nọ n’ofe mmiri nke ọzọ, na-enwe adịmiche.” Oke ọhịa: Ọ kọwara na ụzụ ahịhịa dị n’ọhịa na-eme ma ikuku buo ya na-emetụta olundị. “O nyere nsogbu ka onye nọ n’akụkọ ọhịa nke a na onye nọ n’akụkụ ọhịa nke ọzọ ghọta onwe ha ọfụma.” Ugwu: Nnabụihe kọwara na ugwu nwere ike ịnọchi mmadụ abụọ na-ekwu okwu, “ọ bụrụ na ọ dịrị karịa, o nwere ike ịghọ asụsụ ọzọ”. Kedụ ebe ha si akpọpụta okwu ụfọdụ? Nnabuihe kọwara na adịmiche a na-enwe na ndị na-asụ otu asụsụ nwere ike bụrụ nke metụtara mpaghara okwu maọbụ okwu. Ihe ndị Bekee kpọrọ ‘plosives’, ‘fricatives’ na ‘affricates’. Iji maa atụ: 1. Agbọghọ (girl) = okporo (Onịcha)= mgbọtọ (Owere)= Okposho (Ịka) =okpoho (Enuanị). 2. A nabatara akị na akụ n’Igbo Izugbe mana olundị dị iche nwere ihe ha na-akpọ ya: Akụ (palm kernel) = mkpịrị (Owere) = mkpọkịrị (Mbieri) = agba (Mbaitoolu) 3. Ikwe (mortar) = oshibo (Owere)= otiwe (Mbaise), etiri (Ọlụ) = Onicha 4. Ngaji (spoon) = Ngazị (Ọnịcha) nkọm (Ọhafia) Lee ndịiche dị n’olu ndị ụfọdụ: Olundị e nwere dị gụnyere Waawa, Enuani, Ngwa, Ohuhu, Etche, Olu, Ika, Anioma, Ukwuani, Ikwerre, Ezaa, Izzi, Ekpeye, Ohafia, Abam wdg. Ma lee ndị iche dị n’ụfọdụ olundị ahụ: Nsụka/sh/ = Owere /h/= Onicha/r/ = Enuani/sh/= Ika/h/Mgbochiume /h/ dị n’ahụ (body) bụ /sh/ na Nsụka (eshụ); /r/ n’Ọnịcha(arụ), /sh/ n’Enuani (ashụ), /h/ n’Ịka (ehụ), /h/ n’Owere(ahụ).Ya bụ ndị Nsụka na-akpọ ahụ (body) ‘eshụ,’; ndị Ọnịcha na-akpọ ya ‘arụ’; Owere na-akpọ ya ‘ahụ’; ebe ndị Enuani na-akpọ ya ‘ashụ’. Nsụka /gh/= Owere/ gh/= Onicha /w/=Enuanị /w/= Ịka /h/Ọmụma atụ: Ndị
Olu Ndigbo Di N’Iche N’Iche Read More »
